17 Dịka e dere ya, "Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba."4:17 Jen 17:5 Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị.
Ebraham bụ ihe ịmaatụ banyere okwukwe
18 Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, "Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.4:18 A gaghị agụta ha ọnụ."4:18 Jen 15:5 19 Ọ daghị mba nʼokwukwe ọ bụladị mgbe ọ matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na ọ gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ. 20 Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto. 21 O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa.