Publicidade

Romanos 4

Chineke nabatara Ebraham site nʼokwukwe ya

1 Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Ebraham, nna nna anyị na o nwetara ihe niile site nʼanụ ahụ? 2 A sị na a gụrụ Ebraham dịka onye ezi omume site nʼọrụ aka ya, gaara enwe ihe ga-eji anya isi, ma na bụghị nʼihu Chineke. 3 Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? "Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume."4:3 Jen 15:6

4 Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama bụ ihe ruru ya nʼihi ọrụ rụrụ. 5 Ma nye onye na-enweghị ọrụ ma tinye okwukwe ya na onye ahụ na-agụnye ndị ajọọ omume dịka ndị ezi omume, a ga-eji okwukwe ya gụnyere ya dịka ezi omume. 6 Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya.

7 "Ngọzị na-adịrị

ndị a gbaghaara ajọ omume ha niile,

ndị ekpuchikwara mmehie ha niile.

8 Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,

onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya."4:8 Abụ 32:1-2

9 Ngọzị a dịrị naanị ndị e biri ugwu ka bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya. 10 Olee mgbe a gụrụ ya nye ya? bụ tupu e bie ya ugwu, ka bụ mgbe e bichara ya ugwu? bụghị mgbe e bichara ya ugwu kama bụ tupu e bie ya ugwu. 11 natara ihe ịrịbama nke obibi ugwu dịka akara nke ezi omume nke okwukwe o nwere mgbe nọ na-ebighị ugwu. Nke a bụ ime ya nna ndị niile kweerenụ, ndị ahụ gụrụ dịka ndị ezi omume, bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu. 12 Nʼụzọ dị otu a kwa, bụ nna ndị niile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama bụ okwukwe ha. Nʼihi na Chineke nabatara Ebraham naanị site nʼokwukwe o nwere tupu e bie ya ugwu.

E kwere Ebraham nkwa nʼihi okwukwe ya

13 Nkwa o kwere Ebraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site nʼidebe iwu, kama bụ site nʼezi omume nke okwukwe. 14 Nʼihi na, bụrụ na ndị a ga-enye ihe e kwere na nkwa bụ ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abakwaghị uru, nkwa ahụ enwekwaghị isi ọbụla. 15 Nʼihi na iwu nʼonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Ma ebe iwu na-adịghị, mmehie adịghịkwa.

16 Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na bụ nna anyị niile. 17 Dịka e dere ya, "Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba."4:17 Jen 17:5 Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị.

Ebraham bụ ihe ịmaatụ banyere okwukwe

18 bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, "Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.4:18 A gaghị agụta ha ọnụ."4:18 Jen 15:5 19 daghị mba nʼokwukwe bụladị mgbe matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ. 20 dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka gbasie ike, ka na-enye Chineke otuto. 21 O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa. 22 bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume.4:22 Jen 15:6 23 Okwu ndị a, "A gụrụ ya nye ya dịka onye ezi omume," edeghị ya naanị maka ya. 24 Kama e dere ya nʼihi anyị bụ ndị kwere nʼonye ahụ mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie. 25 Onye a rara nye ka nwụọ nʼihi mmehie anyị niile, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_12-11-46-