Nwa nwoke a mụtara Naomi
13 Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke. 14 Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, "Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile. 15 Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke."
16 Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya. 17 Ndị inyom ndị agbataobi ya sịrị, "Ugbu a, nʼikpeazụ, Naomi enwetala nwa nwoke ọzọ!" Ha gụrụ ya Obed. Ọ bụkwa onye ahụ bụ nna Jesi, onye bụ nna Devid.
Usoro ọmụmụ Devid
18 Nke a bụ usoro ndị a mụrụ site na Perez.
Perez mụrụ Hezrọn
19 Hezrọn mụrụ Ram
Ram mụrụ Aminadab
20 Aminadab mụrụ Nashọn
Nashọn mụrụ Salmọn
21 Salmọn mụrụ Boaz
Boaz mụrụ Obed
22 Obed mụrụ Jesi
Jesi mụrụ Devid.