Pular para o conteúdo
Publicidade

Jemis 2:1-9

Ile mmadụ anya nʼihu

1 Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu. 2 Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, 3 ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, "Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị," ma unu asị onye ogbenye ahụ, "Di anyị, guzo nʼebe ahụ," maọbụ "Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị," 4 ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe?

5 Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya? 6 Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe? 7 Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu?

8 Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, "Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,"2:8 Lev 19:18 unu na-eme ihe ziri ezi. 9 Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.