10 Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara. 11 Nʼihi na onye ahụ sịrị, "Akwala iko,"2:11 Ọpụ 20:14; Dit 5:18 bụkwa onye sịrị, "Egbula mmadụ."2:11 Ọpụ 20:13; Dit 5:17 Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu.
12 Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha.