Okwukwe na omume
14 Olee uru ọ bara ụmụnna m, na mmadụ sịrị, enwere m okwukwe, ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe nʼọrụ ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ pụrụ ịzọpụta ya? 15 Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị, 16 ma otu onye nʼime unu asị ha, "Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ," nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara? 17 Nʼụzọ dị otu a, okwukwe naanị ya bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ esoghị ya.