10 versículos motivacionais: busque inspiração na Palavra de Deus
A Bíblia está cheia de versículos que nos motivam e encorajam a enfrentar os desafios da vida, nos lembrando da força, esperança e amor que encontramos em Deus. Um exemplo poderoso está em Filipenses 4:13, onde Paulo declara: "Posso todas as coisas naquele que me fortalece."
Abaixo, leia 10 versículos bíblicos que podem ajudar a renovar sua motivação em meio a rotina.
Versículos
1. Josué 1:9
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga."
2. Isaías 40:31
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,
ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.
Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;
ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
3. Salmo 23:4
A sịkwarị na m na-aga ije,
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;
nʼihi na ị nọnyeere m,
mkpọrọ gị na mkpanaka gị
na-akasị m obi.
4. Romanos 8:37
Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya.
5. Deuteronômio 31:6
Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu."
6. Salmo 27:1
Abụ nke iguzosi ike
Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu ya?
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
7. Provérbios 3:5-6
Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,
adaberekwala na nghọta gị.
Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,
ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
##
8. 2 Coríntios 12:9
Ma ọ sịrị m, "Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike." Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m.
##
9. Hebreus 12:1-2
Kraịst bụ ihe nlere anya nye anyị
Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.
10. Salmo 46:1
Chineke bụ ebe mgbaba anyị
Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,
onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.
Deus é o Caminho!
A Palavra de Deus é uma fonte inesgotável de encorajamento e motivação. Meditar nesses versículos pode fortalecer sua fé e renovar suas forças para enfrentar os desafios diários.
Compartilhe este artigo com seus irmãos que precisam de inspiração e motivação através da Palavra de Deus.
Deus abençoe!