Publicidade

Oséias 9

Ntaramahụhụ dịrị Izrel

1 Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel,

ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ,

nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna

i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya

nʼelu ebe ịzọcha ọka niile.

2 Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri,

mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha.

3 Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị,

ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt

nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ.

4 Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị,

nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ.

Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị.

Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha.

Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha,

ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

5 Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka,

ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị?

6 A sịkwa na ha agbanarị mbibi,

ndị Ijipt ga-achịkọta ha.

Ndị Memfis ga-elikwa ha.

Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ,

ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile,

7 Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ na-abịa,

Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso.

Ka Izrel mara nke a.

Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu,

nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala,

unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu,

na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara.

8 Ma onye amụma bụ onye nche Chineke,

na-eche Ifrem nche,

ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile,

ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya.

9 Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu,

dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea.

Ọ ga-echeta njehie ha.

Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile.

10 "Mgbe m chọtara Izrel,

ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara;

mgbe m hụrụ nna nna unu ha,

ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig.

Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa,

ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere,

si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ.

11 Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ,

nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime.

12 A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha,

aghaghị m ime ka ha nwụọ.

Ahụhụ ga-adịrị ha,

mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m.

13 Ahụla m na Ifrem yiri Taịa,

bụ ihe akụnyere nʼala mara mma.

Ma Ifrem ga-eji aka ya

kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha."

14 Biko, Onyenwe anyị nye ha.

Gịnị ka i kwesiri inye ha?

Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya,

na ara nke mmiri ara na-adịghị.

15 "Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal,

akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ.

Nʼihi omume mmehie ha niile,

aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha.

Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ,

ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi.

16 Etigbuola Ifrem,

mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla,

ha agaghị amịkwa mkpụrụ.

A sịkwarị na ha amụọ ụmụ,

aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya."

17 Chineke m ga-ajụ ha,

nʼihi na ha adịghị ege ya ntị maọbụ rube isi.

Ha ga-aghọ ndị na-awagharị awagharị na-enweghị ụlọ, nʼetiti mba niile.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-