Publicidade

Oséias 14

Nchegharị na ngọzị

1 Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel;

nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ.

2 Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu

lọghachikwute Onyenwe anyị.

Gwanụ ya sị,

"Gbaghara mmehie anyị niile,

jirikwa ihuọma nabata anyị,

ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja.

3 Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị,

ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị.

Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’

nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa,

nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere."

4 "Aga m agwọ ndaghachi azụ ha,

jiri obi m niile hụ ha nʼanya,

nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa.

5 Aga m adịrị Izrel dịka igirigi.

Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili.

Dịka osisi sida nke Lebanọn,

mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala;

6 ome ya ga-awasa,

ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv,

isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn.

7 Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m.

Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ.

Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị,

a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn.

8 Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ?

Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya.

Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ.

Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa."

9 Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a.

Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara.

Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ.

Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha,

ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-