Publicidade

Oséias 8

Ụgwọ ọrụ mmehie

1 "Tinye opi ike nʼọnụ gị!

Nʼihi na ugo nʼefefe nʼelu ụlọ Onyenwe anyị,

nʼihi na ha emebiela ọgbụgba ndụ m,

nupu isi megide iwu m.

2 Ugbu a ndị Izrel na-etiku m mkpu akwa,

‘Chineke anyị, anyị bụ Izrel maara gị.’

3 Ma Izrel ajụla ihe dị mma.

Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ.

4 Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase;

ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị, ma ghara ịjụta ase nʼaka m.

Ọlaọcha na ọlaedo ha

ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị,

nke ha ji ebibi onwe ha.

5 Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria.

Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha.

Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha?

6 Ọ bụ nʼIzrel ka ha si.

Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya;

ọ bụghị Chineke.

A ga-akụrisikwa

nwa ehi Sameria ahụ.

7 "Ha akụọla ifufe,

ha ga-aghọtakwa oke ifufe.

Osisi ọka ha na-eguzo

na-enweghị okpo ọka ọbụla.

A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ,

ndị mba ọzọ ga-atapịa ya.

8 Elodala Izrel!

Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ

dịka mkpọkọrọ ite.

9 Nʼihi na ha ejeela Asịrịa

dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya.

Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.

10 Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche,

aga m achịkọta ha.

Ha ga-atakwa ahụ

nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha.

11 "Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie,

ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie.

12 E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m,

ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata.

13 Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m,

ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja,

ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị.

Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha,

nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha,

ha ga-alaghachi nʼIjipt.

14 Izrel echezọọla Onye kere ha

ma wukwaa obi ndị eze dị iche iche.

Juda ewukwaala obodo dị iche iche e wusiri ike.

Nʼihi ya, aga m ezite ọkụ nʼobodo ha niile,

ọkụ ga-erepịa obodo ha niile e wusiri ike."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-