Publicidade

Oséias 11

Ịhụnanya Chineke nye Izrel

1 "Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya,

ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.

2 Ma dịka m na-akpọ ha,

otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ.

Ha chụrụ Baal aja,

surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche.

3 Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije,

ejidere m ha nʼaka m abụọ,

ma ha amaghị

na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya.

4 Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere,

na ịhụnanya duo ya.

Adịrị m ha dịka onye nʼebuli

ibu arọ site nʼolu ha,

ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ.

5 "Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt,

Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha,

nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m?

6 Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile,

ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa,

ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile.

7 Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m.

Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu,

ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla.

8 "M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem?

M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel?

M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma?

M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim?

Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m;

ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka.

9 Agaghị m emezu iwe ọkụ m

maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ.

Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ.

Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu.

Agaghị m emegidekwa obodo ha.

10 Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị.

Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm.

Mgbe ọ gbọrọ ụja,

ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya.

11 Dịka igwe nnụnụ

ka ha ga-ama jijiji bịa site nʼIjipt,

dịka nduru ka ha ga-efelata site nʼAsịrịa.

Aga m eme ka ha biri nʼụlọ ha ọzọ,"

otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Mmehie Izrel

12 Ifrem e jirila okwu ụgha gbaa m gburugburu,

ezinaụlọ Izrel e jirila aghụghọ na-emeso m omume,

ma Juda nọsịrị ike nʼekweghị nchịkọta nʼebe Chineke nọ,

ọbụladị megide Onye Nsọ ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-