Pular para o conteúdo
Publicidade

Hosiya 5

Ikpe ọmụma megide Izrel

1 "Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja!

Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel!

Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze.

Nʼihi na bụ unu ka ikpe ahụ gbasara.

Nʼihi na unu abụrụla ihe maa nʼọnya na Mizpa,

na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa.

2 Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ,

aga m ata ha niile ahụhụ.

3 Amaara m ihe niile gbasara Ifrem,

dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ.

Gị Ifrem, ugbu a gbawala akwụna;

gị Izrel, emerụọkwala gị.

4 "Omume ha agaghị ekwe

ka ha laghachikwute Chineke ha,

nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha,

ha amaghịkwa Onyenwe anyị.

5 Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha,

bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha,

Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ.

6 Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha,

gaa ịchọ Onyenwe anyị,

ha agaghị achọta ya.

Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.

7 Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.

Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko.

Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha

ga-eripịa ha na ala ubi ha.

8 "Fụọ opi ike na Gibea,

fụkwaa mpi anụ na Rema.

Tie mkpu agha na Bet-Aven.

Lee anya nʼazụ gị, Benjamin.

9 A ga-ebibi Ifrem kpamkpam

nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ.5:9 Maọbụ, nʼụbọchị ntaramahụhụ

Nʼetiti ebo nke Izrel niile,

ka m na-ekwusa ka amara na bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.5:9 Ya bụ, okwu nʼaghaghị imezu

10 Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ

na-ewezuga oke ala,

aga m awụkwasị ha iwe m

dịka uju mmiri ozuzo.

11 Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu,

onye e ji ike na-azọpịa,

nʼihi na kpacha anya na-achụso ihe efu.

12 Adị m ka nla nye Ifrem,

dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda.

13 "Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa na-arịa,

Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ,

mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa,

ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi.

Ma pụghị ịgwọ gị,

maọbụ gwọọ ọnya gị niile.

14 Nʼihi na-aga m adị ka ọdụm nye Ifrem

dịkwa ka nwa ọdụm nye Juda.

Aga m adọkasị anụ ahụ ha ma hapụ ha pụọ.

Aga m ebupụ ha pụọ, na-enweghị onye ga-abịa ịzọpụta ha.

15 Aga m alaghachi azụ nʼọnọdụ m,

ruo mgbe ha kweere na ikpe mara ha,

ma chọọ ihu m;

nʼọnọdụ mmekpa ahụ ha,

ha ga-achọsi m ike."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também