Publicidade

Oséias 4

Okwu Onyenwe anyị megide Izrel

1 Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel,

nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo

megide unu ndị bi nʼala a.

"Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya,

ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.

2 Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ,

izu ohi na ịkwa iko.

Ọgbaaghara dị nʼebe niile,

ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.

3 Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ,

ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,

ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe,

ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.

4 "Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu,

ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo.

Nʼihi na ndị gị dịka

ndị na-eseso onye nchụaja okwu.

5 Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị,

ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ.

Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi

6 ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe.

"Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma,

aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m;

ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ

mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.

7 Ka ha na-abawanye nʼọnụọgụgụ,

otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m,

ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.

8 Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m.

Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.

9 Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa.

Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ

ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.

10 "Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha.

Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba,

nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị,

were onwe ha nyefee 11 nʼaka ịgba akwụna,

na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ,

nke na-ewepụ mmụọ nghọta.

12 Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme,

na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase.

Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo;

ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.

13 Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile,

na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile,

na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint,

ebe ndo ya dị ezi mma.

Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna,

ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.

14 "Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ,

mgbe ha na-agba akwụna,

maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ

mgbe ha na-akwa iko,

nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna,

ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja,

ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.

15 "Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel,

ma ka ikpe gharakwa ịma Juda.

"Unu agakwala Gilgal,

unu agakwala ruo Bet-Aven,

unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’

16 Ndị Izrel dị isiike

dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike.

Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha

dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?

17 Ifrem na arụsị agbaala ndụ

hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.

18 Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ,

ha na-aga nʼihu na-agba akwụna;

ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.

19 Ifufe ga-ebupụ ha,

aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-