Publicidade

Oséias 6

Nnọgide na nnupu isi Izrel

1 "Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị.

Ya onwe ya adọkaala anyị,

ọ ga-agwọkwa anyị;

o tipụla anyị ọnya,

ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.

2 Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị.

Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị,

meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.

3 Ka anyị mara Onyenwe anyị;

ka anyị gbalịsie ike ịmata ya.

Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite,

nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ,

ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo,

dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri."

4 "Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem?

Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?

Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ,

dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.

5 Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha.

Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha,

ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.

6 Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja,

ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.

7 Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m;

nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.

8 Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe,

nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.

9 Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe,

otu a ka ndị nchụaja

si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem,

leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.

10 Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel.

Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna,

emerụọkwala Izrel.

11 "Ma nye gị onwe gị, Juda,

owuwe ihe ubi nọ na-eche gị.

"Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-