Publicidade

Oséias 12

1 Akaọrụ Ifrem bụ naanị ịchụso ikuku,

ọ na-achụso ikuku si nʼọwụwa anyanwụ bido nʼụtụtụ ruo nʼabalị.

Otu a ka ha si eme ka ịgha ụgha, na ime ihe ike na-abawanye ụba.

Ha na Asịrịa na-agbakwa ndụ,

ha na-ebugakwa mmanụ nʼIjipt.

2 Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe.

Ọ ga-ata Jekọb ahụhụ dịka ụzọ ya si dị,

kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị.

3 Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ.

Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba.

4 E, ya na mmụọ ozi gbara mgba.

Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya.

Ọ hụrụ ya na Betel,

gwaakwa ya okwu,

5 Onyenwe anyị Chineke onye pụrụ ime ihe niile,

Onyenwe anyị bụ aha ya.

6 Ịghaghị ịlọghachikwute Chineke gị,

guzosie ike nʼịhụnanya na ikpe ziri ezi,

na-elekwa anya Chineke gị mgbe niile.

7 Onye ahịa na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ na-erenye ndị mmadụ ahịa,

ọ hụrụ imegbu emegbu nʼanya.

8 Ifrem kwuru,

"Abaala m ọgaranya! Abụrụla m onye nwere akụnụba dị ukwuu!

Ọ bụ ezie na m bụ onye nwere akụ dị ukwuu,

ma agaghị achọta njehie maọbụ mmehie ọbụla nʼime m."

9 "Abụ m Onyenwe anyị na Chineke gị,

onye si nʼIjipt kpọpụta unu.

Aga m emekwa ka ị biri nʼụlọ ikwu ọzọ,

dịka ọ dị nʼoge mmemme ndị ahụ niile a kara aka.

10 A gwara m ndị amụma,

ọ bụ m mere ka ha hụ ọhụ dị iche iche,

sitekwa nʼọnụ ndị amụma tụọ ilu dị iche iche."

11 Gilead ọ na-eme ajọ ihe?

Ndị ya bụ ndị efulefu.

Ha na-achụ aja oke ehi dị iche iche na Gilgal?

Ebe ịchụ aja ha niile ga a dịka ebe a chịkọtara ukwu nkume,

nke dị nʼubi a kọrọ akọ.

12 Jekọb gbalagara nʼala Aram;

Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye,

nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ.

13 Ọ bụkwa onye amụma ka Onyenwe anyị ji site nʼIjipt kpọpụta Izrel,

o sitekwara nʼaka onye amụma lekọtazie ya anya.

14 Ma Ifrem akpasuola iwe ilu nke ukwuu.

Onyenwe ya ga-awụkwasịkwa ya ikpe ọmụma.

Ọ ga-akwụghachi ya dịka nlelị ya si dị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-