A última palavra vem do Senhor
A última palavra pertence ao Senhor. Os planos do homem estão sujeitos à soberania de Deus. Ele rege toda a história e nenhum de seus propósitos pode ser frustrado.
Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime,
ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.
Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya,
o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.
Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ.
Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ.
O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru?
O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?
Onyenwe anyị sịrị Mosis, "Aka Onyenwe anyị ọ dị mkpụmkpụ? Ugbu a, ị ga-ahụ ma m ga-emezu okwu m, maọbụ na m agaghị emezu ya."
Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị.
Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu.
Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee,
baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.
"Abụ m Onyenwe anyị, Chineke nke anụ ahụ niile bụ mmadụ. Ọ dị ihe ọbụla karịrị m ime?
"Amara m na ị pụrụ ime ihe niile;
ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa.
Onyenwe anyị na-eme ihe ọbụla masịrị ya
nʼeluigwe na elu ụwa
na nʼoke osimiri na nʼime ogbu mmiri niile.
Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu.
Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
Lee, ọ na-abịa, nʼezie, ọ ga-emekwa, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Nke a bụ ụbọchị ahụ nke m kwuru ihe banyere ya.
Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo. Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, "Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ."