Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 85

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora.

Ekpere maka ihuọma

1 O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma;

i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.

2 I gbagharala ajọ omume ndị gị,

kpuchikwaa mmehie ha niile. Sela

3 kwụsịla iwe oke iwe gị,

I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.

4 Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,

wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.

5 bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ga na-eweso anyị iwe:

ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?

6 gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ

ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?

7 O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide,

nyekwa anyị nzọpụta gị.

8 Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu;

na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo,

ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.

9 Nʼezie, nzọpụta ya dị nso85:9 Aịz 46:13 ndị na-atụ egwu ya,

ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.

10 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala;

ezi omume na udo esutula ọnụ.

11 Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta,

ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.

12 Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma,

ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.

13 Ezi omume ga-aga nʼihu ya,

idoziri ya ụzọ ga-esi gaa.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também