Publicidade

Salmos 142

Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere.
Ekpere nke onye mkpọrọ

1 Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa;

ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.

2 Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya,

gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya.

3 Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m,

ọ bụ gị maara ụzọ m.

Nʼụzọ ebe m na-esi aga

ka ndị mmadụ siiri m ọnya.

4 Lee anya nʼaka nri m ma hụ

na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m.

Enweghị m ebe mgbaba.

Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.

5 Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị,

na-asị, "Gị bụ ebe mgbaba m,

oke m nʼala ndị dị ndụ."

6 Gee ntị na mkpu akwa m,

nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike;

gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ,

nʼihi na ha siri ike karịa m.

7 Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ,

ka m nwee ike too aha gị.

Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburu

nʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-