Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 134

Abụ nrigo.

Toonu Onyenwe anyị

1 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile

ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị.

2 Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya134:2 1Tm 2:8

ma toonu Onyenwe anyị.

3 Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa

site na Zayọn gọzie unu.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também