Publicidade

Salmos 47

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma.
Chineke bụ eze nke ụwa

1 Kụọnụ aka unu, unu mba niile;

jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.

2 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu.

Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.

3 O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị;

ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.

4 Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị,

ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela

5 Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe.

Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.

6 Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto;

bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.

7 Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile.

Jirinụ abụ too ya.

8 Chineke bụ eze mba niile;

ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.

9 Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala,

dịka ndị Chineke nke Ebraham,

nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke;

ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-