Publicidade

Salmos 24

Abụ Ọma Devid.
Eze onyenwe ebube

1 Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị;

ụwa na ndị niile bi nʼime ya.

2 Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile,

o mekwara ka o guzosie ike.

3 Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị?

Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?

4 Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha,

onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị,

maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.

5 Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị,

natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.

6 Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya,

bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela

7 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama,

meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie,

ka eze ebube nwee ike ịbata.

8 Onye bụ eze ebube a?

Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike.

Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha.

9 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama,

buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie,

ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa.

10 Onye bụ eze ebube a?

Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

ọ bụ ya bụ Eze ebube! Sela

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-