Publicidade

Salmos 67

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ.
Abụ ekele

1 Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị,

ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela

2 Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa,

marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.

3 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;

ka mmadụ niile too gị.

4 Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ,

nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ,

na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela

5 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;

ka mmadụ niile too gị.

6 Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya,

Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.

7 Chineke ga-agọzi anyị,

nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-