Publicidade

Salmos 38

Abụ Ọma Devid. Arịrịọ.
Arịrịọ nʼoge nsogbu

1 Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe,

maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ.

2 Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ,

aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ.

3 Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ;

enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.

4 Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m

dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.

5 Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi

nʼihi mmehie enweghị uche m.

6 Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala

ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.

7 Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu

ahụ adịghịkwa m.

8 Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa.

Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.

9 O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m;

ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.

10 Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m,

ìhè esitekwala nʼanya m pụọ.

11 Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m,

ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.

12 Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya,

ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m;

ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ.

13 Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla,

dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.

14 Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe,

onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.

15 O Onyenwe anyị, ana m eche gị;

o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.

16 Nʼihi na asịrị m, "Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m;

maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ."

17 Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada.

Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.

18 Ana m ekwupụta mmehie m;

mmehie m na-ewute m.

19 Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ,

ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.

20 Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe,

na-ebo ebubo megide m

nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe.

21 O Onyenwe anyị, ahapụkwala m;

O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya.

22 Bịa ọsịịsọ inyere m aka

Onyenwe m na Onye nzọpụta m.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-