Publicidade

Salmos 20

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka enyemaka

1 Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị;

ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.

2 Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka,

ma site na Zayọn kwagide gị.

3 Ya chetakwa aja niile ị chụrụ,

ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela

4 Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,

mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.

5 Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri,

buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị.

Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile.

6 Ugbu a, amaara m

na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ;

ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya,

zọpụta ma zakwaa ya.

7 Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha;

ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi.

8 Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa,

ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm.

9 O Onyenwe anyị, zọpụta eze!

Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-