Publicidade

Salmos 86

Ekpere Devid.
Ekpere maka enyemaka

1 Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m,

nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa.

2 Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi;

zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi.

Ị bụ Chineke m; 3 meere m ebere, O Onyenwe m,

nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile.

4 Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m,

ka m na-eweliri mkpụrụobi m.

5 Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m,

i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị.

6 O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m;

gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere.

7 Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị,

nʼihi na ị ga-aza m.

8 Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m;

ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ.

9 Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị,

fee gị ofufe, O Onyenwe anyị;

ha ga-ebutere aha gị ebube.

10 Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche;

ọ bụ naanị gị bụ Chineke.

11 Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị,

ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị;

nye m obi na-adịghị agba abụọ,

ka m nwee ike tụọ egwu aha gị.

12 Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m;

aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi.

13 Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu;

i sitela nʼomimi nke dị ala

site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m.

14 O Chineke, ndị mpako na-emegide m;

otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m,

ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla.

15 Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,

iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.

16 Chee m ihu, mekwaara m amara.

Nye ohu gị ike gị,

zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị

nʼihi na m na-ejere gị ozi.

17 Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị,

ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme,

nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-