Publicidade

Salmos 99

Toonu Chineke dị nsọ

1 Onyenwe anyị bụ eze,

ka mba niile maa jijiji!

O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim,

ka elu ụwa maa jijiji.

2 Onyenwe anyị dị ukwuu nʼime Zayọn;

ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche.

3 Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu,

ọ dị nsọ.

4 Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya,

i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike;

nʼime Jekọb ka i mere

ihe ziri ezi na ihe dị mma.

5 Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu,

feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya;

ọ dị nsọ.

6 Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya,

Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya;

ha kpọkuru Onyenwe anyị

ọ zakwara ha.

7 Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii.

Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha.

8 O Onyenwe anyị, Chineke anyị,

ị zara ha;

ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie,

nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.

9 Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu;

na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ,

nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-