Publicidade

Salmos 146

Tụkwasị Chineke obi

1 Toonu Onyenwe anyị.

O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.

2 Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile;

aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ.

3 Atụkwasịla ụmụ eze obi gị,

ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta.

4 Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja;

nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu.

5 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb,

onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya.

6 Onye kere eluigwe na ụwa,

na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha,

Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

7 Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu

na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri.

Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha,

8 Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì,

Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba,

Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya.

9 Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa,

na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ,

ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma.

10 Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi,

Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Toonu Onyenwe anyị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-