Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 114

Abụ ncheta ngabiga

1 Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta,

mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,

2 Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke,

Izrel ghọrọ ala na-achị.

3 Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ,114:3 Ọpụ 14:21

osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ114:3 Jos 3:12-16;

4 Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule;

ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.

5 Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ?

Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?

6 Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule?

Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?

7 Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị,

ka maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,

8 onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri,

onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.114:8 Aịz 48:21; 1Kọ 10:4

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também