Publicidade

Salmos 88

Abụ, bụ Abụ Ọma ụmụ Kora, nke dịrị onyeisi Abụ. Nʼusoro olu abụ Mahalat leannot. Abụ Maskil nke Heman onye Ezra.
Akwa maka enyemaka

1 O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m,

nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị.

2 Ka ekpere m bịa nʼihu gị.

Chee ntị gị nụrụ akwa m.

3 Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m,

anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ.

4 Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu.

Adị m dịka onye na-enweghị ike.

5 A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche,

dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili,

ndị ị nakwaghị echeta ọzọ,

ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị.

6 Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi,

olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.

7 Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu;

i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela

8 Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya,

mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ.

Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi;

9 anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ.

O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị;

ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,

10 ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị?

Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? Sela

11 Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị?

A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?

12 A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị?

Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ?

13 Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku.

Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ.

14 O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m?

Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị?

15 Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso;

ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba.

16 Oke iwe gị agabigala nʼahụ m;

ihe egwu gị alaala m nʼiyi.

17 Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri;

ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile.

18 Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya;

ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-