Publicidade

Salmos 14

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.
Ajọ omume nke ndị na-emebi iwu

1 Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,

"Ọ dịghị Chineke ọbụla dị."

Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ;

ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.

2 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe

na-ele ụmụ mmadụ anya

ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta

onye nke na-achọ Chineke.

3 Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;

ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,

ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.

4 Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe?

Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri,

ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị.

5 Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu,

nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume.

6 Unu ndị ajọ omume na-emebi atụmatụ ndị ogbenye,

ma Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba ha.

7 A sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta!

Mgbe Onyenwe anyị ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha,

ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-