Publicidade

Salmos 71

Ekpere maka ndụ ogologo

1 Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ;

ekwela ka ihere mee m.

2 Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m;

tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m.

3 Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,

ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla;

nye iwu maka nzọpụta m,

nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.

4 O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ,

ndị afọ tara mmiri, gbapụta m.

5 Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị,

ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.

6 Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m;

gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m.

Aga m anọgide na-eto gị.

7 Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ,

ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.

8 Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị,

ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.

9 Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi;

ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.

10 Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m;

ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.

11 Ha na-asị, "Chineke agbakụtala ya azụ;

chụọ ya ọsọ, jidekwa ya,

nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya."

12 O Chineke, anọla m ebe dị anya;

O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka.

13 Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha;

ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi

ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.

14 Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile;

aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.

15 Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị

na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile,

ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.

16 Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị,

aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.

17 O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe,

ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.

18 O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi,

mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m,

tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa,

na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.

19 O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe,

gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu.

O Chineke, onye dị ka gị?

20 Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu

nke dị ilu,

ị ga-atụte ndụ m ọzọ;

site nʼebe dị omimi nke ụwa,

ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.

21 Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ.

Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.

22 O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị,

nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị;

aga m eji une bụkuo gị abụ otuto,

gị Onye nsọ nke Izrel.

23 Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ

mgbe m na-abụku gị abụ otuto,

mụ, onye ị gbapụtara.

24 Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta

ọrụ ezi omume gị niile,

nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ,

ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-