Publicidade

Salmos 73

Abụ Ọma Asaf.
Ọgwụgwụ nke ndị na-emebi iwu

1 Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma,

dịkwara ndị obi ha dị ọcha.

2 Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ,

ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.

3 Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo;

mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume.

4 Ha anaghị adọgbu onwe ha;

ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.

5 Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha.

Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.

6 Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha;

ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.

7 Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta;

echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.

8 Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu;

nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.

9 Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha,

ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.

10 Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha,

na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.

11 Ha na-asị, "Olee otu Chineke ga-esi mara?

Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?"

12 Otu a ka ndị ajọ omume dị,

ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.

13 Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha,

nʼefu ka m kwọrọ aka m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.

14 Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu;

ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.

15 Ọ bụrụ na m kwuru sị, "Nke a ka m ga-ekwu,"

agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.

16 Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile,

ọ ghọọrọ m ihe mwute,

17 tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke;

mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.

18 Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị;

ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.

19 Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya,

bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!

20 Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta,

otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara,

ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.

21 Mgbe m nọ nʼobi mwute;

mmụọ m dara mba.

22 Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe.

Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.

23 Ma ana m anọnyere gị mgbe niile;

ị na-ejide m nʼaka nri m.

24 Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m,

ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.

25 Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị?

Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.

26 Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba,

ma Chineke bụ ike nke obi m,

na ihe nketa m ruo ebighị ebi.

27 Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi.

Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.

28 Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso.

Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m.

Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-