Publicidade

Salmos 40

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.
Abụ ekele

1 Eji m ndidi chere Onyenwe anyị,

ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.

2 O sitere nʼolulu na-amị amị,

nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m;

o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume,

nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.

3 O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m,

abụ otuto nye Chineke anyị.

Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu,

ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.

4 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ,

onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya;

onye na-adịghị ele ndị mpako anya

maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.

5 O Onyenwe anyị Chineke m,

ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ,

ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile

ị kwadooro maka inye anyị;

a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha,

ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.

6 Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ

ma ị megheela ntị abụọ;

aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.

7 Mgbe ahụ, ekwuru m sị, "Lee m, abịala m,

e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.

8 O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ,

iwu gị dị nʼime obi m."

9 Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi;

dịka ị maara, o Onyenwe anyị,

anaghị m emechi ọnụ m.

10 Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m,

ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị.

Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị,

nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.

11 O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị,

ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.

12 Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu;

mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ:

ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi,

obi m na-adakwa mba nʼime m.

13 O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m;

O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.

14 Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m,

bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara;

ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m,

laghachi azụ nʼihere.

15 Ka ndị ahụ na-asị m,

"Ehee! Ehee!" kụja nʼihi ihere onwe ha.

16 Ma ka ndị niile na-achọ gị

ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị;

ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile,

"Onyenwe anyị dị ukwuu."

17 Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa;

ka Onyenwe anyị cheta m.

Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m;

Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-