Publicidade

Salmos 122

Abụ nrigo, nke Devid.
Ekpere maka udo Jerusalem

1 Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m,

"Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị."

2 Ụkwụ anyị eguzola ugbu a

nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.

3 E wuru Jerusalem dịka obodo

a chịkọtara ọnụ nke ọma.

4 Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo,

bụ ebo niile nke Onyenwe anyị,

ịbụku aha Onyenwe anyị abụ

dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị.

5 Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị,

bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.

6 Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem:

"Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo.

7 Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile

nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike."

8 Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m,

ana m ekwu okwu sị, "Udo dịrị gị."

9 Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị,

aga m achọ ọganihu gị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-