Publicidade

Salmos 11

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.
Onyenwe anyị ebe mgbaba

1 Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m.

Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị,

"Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ."

2 Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha;

ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha,

zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ,

ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.

3 Mgbe a na-ebibi ntọala niile,

gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?

4 Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya;

Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.

Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme;

anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.

5 Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule,

ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya,

ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.

6 Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume

dịka mmiri ozuzo;

oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.

7 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume,

ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya;

ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-