Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 11

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Onyenwe anyị ebe mgbaba

1 Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m.

Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị,

"Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ."

2 Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha;

ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha,

zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ,

ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.

3 Mgbe a na-ebibi ntọala niile,

gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?

4 Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya;

Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.11:4 Nke a bụ maka ocheeze Onyenwe anyị

na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme;

anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.

5 Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule,

ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya,

ka na-akpọ asị nke ukwuu.

6 ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume

dịka mmiri ozuzo;

oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.

7 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume,

hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya;

ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também