Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 138

Abụ Ọma Devid.

Onyenwe anyị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi

1 O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị;

nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto.

2 Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị

aga m etokwa aha gị

nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị,

nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị

dị elu karịa ihe niile.138:2 Aịz 42:21

3 Mgbe m kpọkuru gị, zara m;

i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.

4 O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị,

mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu.

5 Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị,

nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu.

6 Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya,

ma naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso.

7 A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu,

na-echebe ndụ m;

na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị,

na-eji aka nri gị zọpụta m.138:7 Abụ 23:3-4

8 Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;138:8 Fil 1:6

ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ahapụkwala ọrụ aka gị niile.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também