Publicidade

Salmos 72

Abụ nke Solomọn.
Ekpere maka eze

1 O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze.

Nyekwa nwa eze ezi omume gị.

2 Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị,

jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.

3 Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba;

ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.

4 Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,

zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa;

ọ ga-egwepịa onye mmegbu.

5 Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,

dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.

6 Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ,

dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.

7 Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa;

ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa.

8 Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri,

na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa

9 Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya,

ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.

10 Ndị eze Tashish na mba niile dị nʼebe dị anya,

ga-atụ ụtụ wetara ya;

e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba,

ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye.

11 Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya,

mba niile ga-ejekwara ya ozi.

12 Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya.

Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.

13 Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa,

ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.

14 Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike,

nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.

15 Ka ọ dị ogologo ndụ!

Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba.

Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile,

ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.

16 Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;

ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile.

Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn;

ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.

17 Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;

ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide.

A ga-esite na ya gọzie mba niile,

a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.

18 Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel,

onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.

19 Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi;

ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.

Amen na Amen.

20 Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-