Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 72

Abụ nke Solomọn.

Ekpere maka eze

1 O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze.

Nyekwa nwa eze ezi omume gị.

2 ga-eji ezi omume chịa ndị gị,

jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.

3 Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba;

ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.

4 ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,

zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa;

ga-egwepịa onye mmegbu.

5 Ka dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,

dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.

6 ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ,

dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.

7 Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa;

ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa.

8 ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri,

na-esite nʼiyi ukwu.72:8 Nke a na-ekwu banyere osimiri Yufretis. Mgbe Solomọn na-achị, ọ bụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Izrel ka ọ dị. Ọ bụ otu ihe e kwere ndị Izrel na nkwa mgbe ha si nʼọnọdụ ohu na-ahapụ Ijipt. Ọpụ 23:31; Zek 9:10 ruo na nsọtụ niile nke ụwa72:8 Ọ bụ site nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼosimiri Nwụrụ anwụ, ka a maara dị ka nsọtụ ụwa nʼoge ahụ.

9 Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya,

ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.

10 Ndị eze Tashish72:10 Obodo Tashish dị nʼala Spen, ọ nọchiri anya nsọtụ nke ụwa, 2Ih 9:21 na mba niile dị nʼebe dị anya,

ga-atụ ụtụ wetara ya;

e, bụladị ndị eze si Sheba na Seba,72:10 Ala Sheba dị nʼArebịa, ebe ala Seba dị nʼAfrika.

ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye.

11 Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya,

mba niile ga-ejekwara ya ozi.

12 Nʼihi na ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya.

ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.

13 ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa,

ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.

14 ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike,

nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.

15 Ka dị ogologo ndụ!

Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba.

Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile,

ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.

16 Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;

ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile.

Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn;

ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.

17 Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;

ka na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide.

A ga-esite na ya gọzie mba niile,

a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.

18 Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel,

onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.

19 Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi;

ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.

Amen na Amen.

20 Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também