Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 75

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ "E bibikwala." Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.

Ikpe ikpe ziri ezi nke Chineke

1 Anyị na-eto gị, O Chineke.

Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso.

Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.

2 na-asị, "Ana m ahọpụta oge a kara aka.

bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.

3 Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji,

bụ m na-ejidesi ogidi75:3 Ya bụ, ntọala ya ike ka o guzo chịm. Sela

4 Nye ndị mpako, ana m asị, Unu etukwala ọnụ ọzọ,

nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi75:4 Mpi na-anọchite anya ike nʼebe a unu elu.

5 Unu ewelila mpi unu megide eluigwe;

unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ "

6 dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ,

maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.

7 Kama bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe;

na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.

8 Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị

nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche.

na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa

na-aṅụ ya ruo mgbe gwụsịrị.

9 Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi.

Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,

10 bụ onye sịrị, "Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile,

ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também