Publicidade

Salmos 136

Abụ ekele

1 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

2 Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

3 Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

4 Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,

ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

5 Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

6 Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

7 Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

8 Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

9 Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

10 Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

11 O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

12 O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha;

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

13 Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

14 Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya,

nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

15 Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile;

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

16 Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

17 Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

18 O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

19 O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

20 Na Ọg eze Bashan,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

21 Were ala ha nye dịka ihe nketa,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

22 O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

23 Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

24 Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

25 Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

26 Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-