Publicidade

Salmos 141

Abụ Ọma Devid.
Arịrịọ nke ezi mmadụ

1 O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ.

Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị.

2 Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ;

ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị.

3 Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị;

na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.

4 Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ,

isonye ndị na-eme ihe ọjọọ

rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche;

ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.

5 Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere;

ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m.

Isi m agaghị ajụ ya.

Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ.

6 A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha,

mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu.

7 Ha ga-ekwu sị, "Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala,

otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili."

8 Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị

nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ.

9 Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri,

sitekwa nʼọnya niile ha siiri m.

10 Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha,

ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-