Publicidade

Salmos 148

Toonu Onyenwe ihe niile

1 Toonu Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe,

toonu ya nʼebe niile kachasị elu.

2 Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile,

toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.

3 Toonu ya, anyanwụ na ọnwa

toonu ya, kpakpando niile.

4 Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu

na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe.

5 Ka ha niile too aha Onyenwe anyị,

nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya.

6 O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi;

o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.

7 Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa,

unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile,

8 na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile,

na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu,

9 unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile

na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile

10 na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile,

na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile,

11 ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche,

unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,

12 ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ,

ndị okenye na ụmụntakịrị.

13 Ka ha niile too aha Onyenwe anyị,

nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu;

ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.

14 O meela ka mpi ndị ya dị elu,

otuto ndị nsọ ya niile,

nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya.

Toonu Onyenwe anyị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-