Publicidade

Salmos 55

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid.
Ekpere nke onye enyi ya ghọrọ ya aghụghọ

1 O Chineke, nụrụ ekpere m,

agbakwala arịrịọ m nkịtị;

2 ṅaa m ntị, zaakwa m.

Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude

3 nʼihi ihe onye iro m na-ekwu,

nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ,

nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ,

na-akpagbu m nʼiwe ha.

4 Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m;

oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m.

5 Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m;

oke egwu ekpuchiela m.

6 Agwara m onwe m okwu sị, "A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru!

Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.

7 Agaara m efelaga ebe dị anya,

ga nọrọ nʼọzara; Sela

8 Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m,

ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị."

9 O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu,

nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo.

10 Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya;

iro na mmegbu dị nʼime ya.

11 A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo;

ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo.

12 A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị,

apụrụ m ịnagide ya;

a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m,

apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ.

13 Maọbụ gị, nwoke dịka m,

onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma,

14 onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ,

nʼụlọ Chineke,

ka anyị na-ejegharị

nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.

15 Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede;

ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ,

nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha.

16 Ma akpọkuru m Chineke,

Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m.

17 Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị,

ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya

ma ọ na-anụkwa olu m.

18 Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ,

site nʼagha niile e busoro m,

nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m.

19 Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi,

onye na-adịghị agbanwe,

ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ,

nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. Sela

20 Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya,

ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ.

21 Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ ka bọta,

ma ibu agha juru ya obi;

okwu ya niile dị nro karịa mmanụ,

ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha.

22 Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,

ọ ga-agba gị ume;

ọ gaghị ekwe

ka ewezuga onye ezi omume.

23 Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume

nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure;

ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ

agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha.

Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-