Publicidade

Salmos 65

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Otu Abụ.
Ịdị mma na ịdị ike nke Chineke

1 I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn;

ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị,

2 O gị onye na-anụ ekpere,

ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,

3 Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị,

ị gbaghara anyị njehie anyị niile.

4 Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara,

ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị!

E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị,

mee ka afọ ju anyị.

5 O Chineke, Onye nzọpụta anyị,

i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị,

ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa,

na osimiri niile dị ebe dị anya,

6 onye ji ike ya kpụọ ugwu niile,

ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha,

7 onye mere ka ụda olu oke osimiri niile

na ụda olu ebili mmiri,

na ọgbaaghara mba niile deere duu.

8 Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile,

nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada,

ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ.

9 Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri;

ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma.

Isi iyi Chineke adịghị ata ata,

nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi,

nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị.

10 Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị;

ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya.

11 Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze,

ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke.

12 Ala ebe ahịhịa na-epu nʼọzara na-ejupụta nʼahịhịa ndụ,

e yikwasịrị ugwu niile obi ụtọ dịka uwe.

13 E were igwe anụ ụlọ kpuchie nʼelu ala niile ebe ahịhịa dị ndụ puru,

ọka kpuchikwara ndagwurugwu niile;

ha na-eti mkpu ọṅụ na-abụkwa abụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-