Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 124

Abụ nrigo. Nke Devid.

Ekele maka mgbapụta

1 A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị,

ka Izrel kwuo,

2 a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị,

mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,

3 mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị,

ha gaara eloda anyị na ndụ;

4 idee mmiri gaara iri anyị,

oke mmiri gaara ebufu anyị,

5 ebili mmiri niile

gaara ebufu anyị.

6 Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị

ka ha jiri eze ha dọrie anyị.

7 Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si

gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya;

ọnya ahụ agbajiela,

anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.

8 Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị,

onye kere eluigwe na ụwa.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também