Publicidade

Salmos 22

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke "Nne ele nke ụtụtụ." Abụ Ọma Devid.
Akwa na abụ ekele

1 Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?

Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m,

nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?

2 O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m,

nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.

3 Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ;

ị bụ otuto ndị Izrel.

4 Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi;

ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.

5 Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara;

ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.

6 Abụ m idide, abụghị m mmadụ;

onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.

7 Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;

na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.

8 "O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi;

ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya.

Ya napụta ya ebe ọ bụ

na ihe ya masịrị ya."

9 Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m.

Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.

10 Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.

Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.

11 Anọla m ebe dị anya,

nʼihi na nsogbu dị nso.

Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.

12 Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu;

oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.

13 Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa

asaghepụla ọnụ ha megide m.

14 A wụpụla m dịka mmiri,

ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha.

Obi m agbazela dịka mmanụ,

obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.

15 Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.

Ire m na-araparakwa m nʼọnụ,

nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.

16 Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu;

otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu,

ha adupuola m aka m na ụkwụ m.

17 A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ;

ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị

18 Ha na-eke uwe m nʼetiti ha,

ha sitere nʼife nza kee uwe m.

19 Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya;

gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.

20 Napụta ndụ m site na mma agha,

site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.

21 Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a,

zọpụta m site na mpi atụ ndị a.

22 Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m;

nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.

23 Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya;

unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya!

Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!

24 Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya

maọbụ kwaa ya emo;

o lefughị ya anya

kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.

25 Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị;

aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.

26 Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha,

ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya

ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

27 Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta,

ma laghachikwute Onyenwe anyị.

Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche

ga-akpọ isiala nʼihu ya.

28 Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị,

ọ na-achịkwa mba niile.

29 Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya;

ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya;

ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.

30 Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi;

a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.

31 Ha ga-ekwusa ezi omume ya

nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị

nʼihi na o meela ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-