Publicidade

Salmos 108

Abụ, Abụ Ọma Devid.
Ekpere nʼoge nsogbu

1 Obi m dị njikere, o Chineke;

aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu.

2 Teta! Ụbọ akwara na une!

Aga m akpọte chi ọbụbọ.

3 Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile;

aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.

4 Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe;

ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.

5 Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile,

ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

6 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,

ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.

7 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,

"Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,

tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya.

8 Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m;

Ifrem bụ okpu igwe m,

Juda bụ mkpara eze m.

9 Moab bụ efere ịkwọ aka m,

aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm

nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri."

10 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?

Onye ga-edu m gaa Edọm?

11 Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị,

onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?

12 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,

nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.

13 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,

ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-