Publicidade

Salmos 2

Onye Chineke tere mmanụ

1 Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo?

Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?

2 Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha,

ndị na-achị achị na-agbakọtakwa

imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.

3 Ha na-asị, "Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị

ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị."

4 Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị.

Onyenwe anyị na-akwa ha emo.

5 Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba

mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya.

6 "Mụ onwe m eguzobela m eze m

na Zayọn, ugwu m dị nsọ."

7 Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị:

Ọ sịrị m, "Ị bụ Ọkpara m;

taa abụrụla m nna gị.

8 Rịọọ m,

aga m enye gị mba niile nke ụwa

ka ha bụrụ ihe nketa gị.

9 Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha,

tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma."

10 Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche;

ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa.

11 Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe;

jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.

12 Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya,

ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu.

Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya.

Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-