Publicidade

Salmos 127

Abụ nrigo, nke Solomọn.
Chineke dị mkpa

1 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ,

ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.

Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo,

nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.

2 Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ

na-adọgbu onwe gị nʼọrụ

ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị,

nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.

3 Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,

ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.

4 Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha,

otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.

5 Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ

onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya.

Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro

na-arụrịta ụka nʼama.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-