Publicidade

Salmos 63

Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda.
Onye ihe Chineke na-agụsị agụụ ike

1 O Chineke, ị bụ Chineke m,

e ji m obi m niile na-achọ gị;

akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ,

anụ ahụ m na-achọsi gị ike,

nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba

ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.

2 Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị,

hụkwa ike gị na ebube gị.

3 Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,

aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.

4 Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị,

aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.

5 Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ;

aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.

6 Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị,

ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.

7 Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m,

ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.

8 Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ;

aka nri gị na-ejigide m.

9 A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi;

ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.

10 A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi,

ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.

11 Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke;

ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya,

ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-