Publicidade

Salmos 93

Ịdị ukwuu nke Onyenwe anyị

1 Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe;

Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu;

nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya.

2 Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie;

ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị.

3 Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị;

oke osimiri niile eweliela olu ha elu;

ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ.

4 Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu

karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme,

ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.

5 Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike;

ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma

ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-